Eze ahu di, nke kwesiri ike di mkpa iji taa nri nke oma.
Eze imebi emebi, na kwa nke oyere jugoru nke na afu ajo ufu bu ufodu ihe ileta eze anya ga egbochi.
Eze retoro ereto nwere ike iburu ajo infekshun site na eze, bugaa ya n’akuku ahu ndi ozo.
Ndi na ahapu eze ha, na anaghi eleta ya anya bu udi ndi ga aka nka ghara inwe eze obula foduru.
Ekwesiri ihicha eze ugboro abuo kwa ubochi. Nke a ga ewepu nje na ebute eze mgbu, eze mmebi na eze idapu. Hichaa ihu na azu eze, ibia hichaa n’etiti eze na okpuru ukwu eze. Were atu na akataghi ahu ma o bu mkpisi atu were mee nkea. Tutupest (toothpaste) di mma mana inwere ike ita atu ma inweghi ya. I ga ejinwu nnu, bakin soda, ma o bu naani mmiri di ocha.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.