Gịnị bụ ọgbụgba mmiri nke ntapu n'ubi

From Audiopedia
Jump to: navigation, search

Ọgbụgba mmiri nke ntapu bụ usoro ịgba mmiri nwere ezi ngosi amamihe nke na-ebuga mmiri ozugbo na mgbọrọgwụ osisi.

N'ọtụtụ akụkụ ụwa, ịgba mmiri ka bụ ihe dị mkpa na mmepụta ihe ọkụkụ. Ọbụlagodi na e nwere mmiri ozuzo, ụfọdụ ihe ọkụkụ ka chọrọ ọgbụgba mmiri n'ubi ọkachasị na mpaghara kpọrọ nkụ na nke kpọtụrụ nkụ. Okpomọkụ siri ike na ọnọdụ ihu igwe kpọrọ nkụ nwere ike bụrụ nnukwu ihe ịma aka maka uto na mmepe nke ihe ọkụkụ kwesịrị ekwesị. N'agbanyeghi na ịgba mmiri dị oke mkpa, iji mmiri ebe ọ dị ukwuu nwere ike ịkpata nsogbu dị ka ịta nri ihe ọkụkụ, mbelata uto mgbọrọgwụ, nkwakọta mmiri, nwulite nnu na mpaghara mgbọrọgwụ yana ibelata ogo ị dị mma ihe ọkụkụ na mmepụta.

Otu ụdị ọgbụgba mmiri nke jisiri ike chekwaa ego ndị ọrụ ugbo ma na-amụba ihe ha na-amịpụta bụ ọgbụgba mmiri nke ntapu. Ọgbugba mmiri nke ntapu bụ ụdị ọgbụgba mmiri n'ubi nke na-echekwa mmiri site na iji nwayọọ na-ebuga mmiri na mpaghara mgbọrọgwụ nke osisi. Ya mere, iji hụ na i nwere uto osisi kwesịrị ekwesị na nnukwu mmịpụta, e nwere ike ịwụnye usoro ọgbụgba mmiri nke ntapu.


Sources
  • Audiopedia ID: Ig3110